by Henry Ekwuruke | |
Published on: Dec 3, 2005 | |
Topic: | |
Type: Poetry | |
https://www.tigweb.org/express/panorama/article.html?ContentID=6700 | |
Nmepe bu ihe di oke mpka Na obodo anyi ugbu a Okacha si ugbu a anyi Batara na ochichi onye kwu uche ya Nmepe, gini bu kwanu nmepe? Nmepe bu uzo esi akwado obodo O bu uzo esi ekuli aku na uba Obodo obula ka ha welite isi elu Ogwula? Mba, nmepe by agwughi agwu O na aga aga O naghi ano out ebe Eliwe uzo, liwe ehi Ma ahoro uzo hara ehi Maka ehi bu anu erie ya agwu Mana uzo bu agwu agwu Nmepe obodo anyi bu nmepe ndi mmadu O bu nkwado ulo akwukwo anyi O ga emekwa ka olu aka obodo puta ihe Anyi choro nmepe Buru nmepe ugbu a ndi ike m Maka ngbanwe na nkanuzu Obodo anyi cho siri nmepe ike Maka ndi obodo anyi na umu aka anyi Ihe di nma bu nwanma ka a na akpo ya! « return. |